Izikiel 36:11
Ezekiel 36:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
Ezekiel 36:11 in English
Ezekiel 36:11 · Berean Standard Bible
I will fill you with people and animals, and they will multiply and be fruitful. I will make you as inhabited as you once were, and I will make you prosper more than before. Then you will know that I am the LORD.
Context
9Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu. 10Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ. 11Aga m eme ka ọnụọgụgụ ndị mmadụ, na anụ ụlọ dị nʼime gị baa ụba. Ha ga-amụbakwa, jupụtakwa ebe niile. Ndị mmadụ ga-ebikwa nʼelu gị dịka ha si biri nʼoge gara aga. Aga m emekwa ka ihe gaara ha nke ọma karịa ka ọ dị na mbụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 12Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ. 13“ ‘Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼihi na ụfọdụ mba na-ekwutọ gị na-asị, “Ị bụ ala na-eri ụmụ ya, ala na-agbaba ndị ya aka ụmụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.