Izikiel 33:7
Ezekiel 33:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
Ezekiel 33:7 in English
Ezekiel 33:7 · Berean Standard Bible
As for you, O son of man, I have made you a watchman for the house of Israel; so hear the word from My mouth and give them the warning from Me.
Context
5Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha. 6Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’ 7“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị. 8Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 9Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.