Izikiel 33:5
Ezekiel 33:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha.
Ezekiel 33:5 in English
Ezekiel 33:5 · Berean Standard Bible
Since he heard the sound of the horn but failed to heed the warning, his blood will be on his own head. If he had heeded the warning, he would have saved his life.
Context
3onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa, 4ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi. 5Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha. 6Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’ 7“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.