Native Bible

Ezekiel 33:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.

Ezekiel 33:8 in English

Ezekiel 33:8 · Berean Standard Bible

If I say to the wicked, ‘O wicked man, you will surely die,’ but you do not speak out to dissuade him from his way, then that wicked man will die in his iniquity, yet I will hold you accountable for his blood.

Context

6Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’ 7“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị. 8Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 9Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara. 10“Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?” ’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.