Izikiel 33:29
Ezekiel 33:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
Ezekiel 33:29 in English
Ezekiel 33:29 · Berean Standard Bible
Then they will know that I am the LORD, when I have made the land a desolate waste because of all the abominations they have committed.’
Context
27“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa. 28Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ. 29Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’ 30“Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’ 31Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.