Native Bible

Ezekiel 33:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.

Ezekiel 33:31 in English

Ezekiel 33:31 · Berean Standard Bible

So My people come to you as usual, sit before you, and hear your words; but they do not put them into practice. Although they express love with their mouths, their hearts pursue dishonest gain.

Context

29Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’ 30“Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ Onyenwe anyị.’ 31Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta. 32Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla. 33“Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.” 33:11 Ụzọ nʼebe a, na-ekwu maka mmebi iwu 33:11 Maọbụ, mmehie unu

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.