Izikiel 33:27
Ezekiel 33:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.
Ezekiel 33:27 in English
Ezekiel 33:27 · Berean Standard Bible
Tell them that this is what the Lord GOD says: ‘As surely as I live, those in the ruins will fall by the sword, those in the open field I will give to be devoured by wild animals, and those in the strongholds and caves will die by plague.
Context
25Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a? 26Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’ 27“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa. 28Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ. 29Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.