Native Bible

Ezekiel 33:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’

Ezekiel 33:26 in English

Ezekiel 33:26 · Berean Standard Bible

You have relied on your swords, you have committed detestable acts, and each of you has defiled his neighbor’s wife. Should you then possess the land?’

Context

24“Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’ 25Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a? 26Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’ 27“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa. 28Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.