Izikiel 32:22
Ezekiel 32:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha.
Ezekiel 32:22 in English
Ezekiel 32:22 · Berean Standard Bible
Assyria is there with her whole company; her graves are all around her. All of them are slain, fallen by the sword.
Context
20Nʼetiti ndị e ji mma agha gbuo ka ha ga-ada. Amịpụtala mma agha maka ya, ka a dọkpụrụ ya na igwe ndị ya niile pụọ. 21Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’ 22“Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha. 23Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha. 24“Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.