Izikiel 32:23
Ezekiel 32:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha.
Ezekiel 32:23 in English
Ezekiel 32:23 · Berean Standard Bible
Her graves are set in the depths of the Pit, and her company is all around her grave. All of them are slain, fallen by the sword— those who once spread terror in the land of the living.
Context
21Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’ 22“Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha. 23Ili ha dị na nsọtụ niile nke olulu, ndị agha ya niile gbakwara ili ya gburugburu. E gbudala ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. Ndị a nwụrụ site na mma agha. 24“Nʼebe ahụ ka Elam na usuu ndị agha ya nọ gbaa ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị e gburu egbu, ndị nwụrụ site na mma agha. Ndị niile mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ arịdaruola nʼolulu ahụ dịka ndị a na-ebighị ugwu. Ha esorola ndị ahụ rịdaruru nʼala mmụọ keta oke nʼihere dịrị ha. 25E meere ya ebe ndina nʼetiti ndị nwụrụ anwụ. Igwe mmadụ ya nwụrụ anwụ gbakwara ili ya gburugburu. Ha niile bụ ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na-emere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ, ma ha na-eburu ihere ha, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu. Ha bụ ndị e debere nʼetiti ndị nwụrụ anwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.