Native Bible

Ezekiel 32:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼafọ nke iri na abụọ, nʼọnwa nke iri na abụọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,

Ezekiel 32:1 in English

Ezekiel 32:1 · Berean Standard Bible

In the twelfth year, on the first day of the twelfth month, the word of the LORD came to me, saying,

Context

1Nʼafọ nke iri na abụọ, nʼọnwa nke iri na abụọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buliere Fero bụ eze Ijipt, abụ akwa sị ya, “ ‘Ị dị ka ọdụm nʼetiti mba niile. Ị dịkwa ka ogologo anụ ọjọọ na-anọ nʼosimiri. I na-akpụgharị onwe gị nʼime mmiri. I ji ụkwụ abụọ na-agbarụ mmiri, na-emekwa ka mmiri iyi niile gbarụọ. 3“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Aga m eji ọtụtụ ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ gbasaa ụgbụ m nʼelu gị. Ha ga-adọkpụkwara gị nʼime ụgbụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.