Izikiel 3:16
Ezekiel 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
Ezekiel 3:16 in English
Ezekiel 3:16 · Berean Standard Bible
At the end of seven days the word of the LORD came to me, saying,
Context
14Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m. 15A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib* nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma. 16Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, 17“Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị. 18Mgbe m na-asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma ọ bụrụ na ị dọghị ya aka na ntị, maọbụ ị kwughị okwu ime ka ha chigharịa site nʼụzọ ọjọọ ha niile pụta nʼihi ịzọpụta ndụ ha, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.