Native Bible

Ezekiel 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m.

Ezekiel 3:14 in English

Ezekiel 3:14 · Berean Standard Bible

So the Spirit lifted me up and took me away, and I went in bitterness and in the anger of my spirit, with the strong hand of the LORD upon me.

Context

12Mgbe ahụ, Mmụọ ahụ buliri m elu. Anụrụ m olu mere oke ụzụ nʼazụ m, mgbe ebube nke Onyenwe anyị sị nʼọnọdụ ya bilie. 13Ọ bụ ụzụ nke nku ihe ndị ahụ dị ndụ na-eme mgbe ha na-emetụrịta nku ibe ha; ọ bụkwa ụzụ ụkwụ wịịlu ha nke dị nʼakụkụ ha. 14Mmụọ ahụ buliri m, bupụ m. Ejegharịrị m nʼobi ilu na iwe nke mmụọ m, ebe aka Onyenwe anyị dịkwa ike nʼahụ m. 15A bịakwutere m ndị ahụ a dọọrọ nʼagha, ha aga biri na Tel Abib* nʼakụkụ osimiri Keba. Nʼebe ahụ, bụ ebe ha na-ebi, anọdụrụ m nʼetiti ha abalị asaa, nʼọnọdụ obi ilu na ọnụma. 16Mgbe abalị asaa gasịrị, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.