Izikiel 29:7
Ezekiel 29:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.
Ezekiel 29:7 in English
Ezekiel 29:7 · Berean Standard Bible
When Israel took hold of you with their hands, you splintered, tearing all their shoulders; when they leaned on you, you broke, and their backs were wrenched.*
Context
5Aga m ahapụ gị
na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara,
ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi,
a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu,
nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri
nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile. 6Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
“ ‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ. 7Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha. 8“ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị. 9Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.