Native Bible

Ezekiel 22:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

Ezekiel 22:23 in English

Ezekiel 22:23 · Berean Standard Bible

And the word of the LORD came to me, saying,

Context

21Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya. 22Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’ ” 23Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 24“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’ 25E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze* nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.