Izikiel 22:24
Ezekiel 22:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’
Ezekiel 22:24 in English
Ezekiel 22:24 · Berean Standard Bible
“Son of man, say to her, ‘In the day of indignation, you are a land that has not been cleansed, upon which no rain has fallen.’
Context
22Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’ ” 23Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 24“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’ 25E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze* nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya. 26Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.