Native Bible

Ezekiel 20:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere.

Ezekiel 20:4 in English

Ezekiel 20:4 · Berean Standard Bible

Will you judge them, will you judge them, son of man? Confront them with the abominations of their fathers

Context

2Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 3“Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ 4“Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere. 5Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.” 6Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.