Izikiel 20:5
Ezekiel 20:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
Ezekiel 20:5 in English
Ezekiel 20:5 · Berean Standard Bible
and tell them that this is what the Lord GOD says: On the day I chose Israel, I swore an oath to the descendants of the house of Jacob and made Myself known to them in the land of Egypt. With an uplifted hand I said to them, ‘I am the LORD your God.’
Context
3“Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ 4“Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere. 5Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.” 6Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma. 7Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.