Izikiel 20:37
Ezekiel 20:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee,* aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ.
Ezekiel 20:37 in English
Ezekiel 20:37 · Berean Standard Bible
I will make you pass under the rod and will bring you into the bond of the covenant.
Context
35Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu. 36Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 37Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee,* aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. 38Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 39“ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.