Izikiel 20:39
Ezekiel 20:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m.
Ezekiel 20:39 in English
Ezekiel 20:39 · Berean Standard Bible
And as for you, O house of Israel, this is what the Lord GOD says: Go and serve your idols, every one of you. But afterward, you will surely listen to Me, and you will no longer defile My holy name with your gifts and idols.
Context
37Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee,* aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. 38Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 39“ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m. 40Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 41Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.