Native Bible

Ezekiel 16:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere* onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ,* mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye.

Ezekiel 16:25 in English

Ezekiel 16:25 · Berean Standard Bible

At the head of every street you built your lofty shrines and degraded your beauty. With increasing promiscuity, you spread your legs to all who passed by.

Context

23“ ‘Ahụhụ, ahụhụ, ga-adịrị gị, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Tinyekwara ajọ omume gị niile, 24i wuuru arụsị gị ụlọ ebe ịkwa iko, wuokwa ụlọ arụsị ndị ọzọ nʼakụkụ okporoụzọ niile. 25I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere* onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ,* mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye. 26Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba. 27Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.