Native Bible

Ezekiel 16:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi.

Ezekiel 16:27 in English

Ezekiel 16:27 · Berean Standard Bible

Therefore I stretched out My hand against you and reduced your portion. I gave you over to the desire of those who hate you, the daughters of the Philistines, who were ashamed of your lewd conduct.

Context

25I wuuru onwe gị ebe ịchụ aja e wuliri elu dị iche iche nʼisi ụzọ niile, si otu a merụọ mma gị. Nʼebe ahụ ka ị na-anọ na-emeghere* onye ọbụla gafetara ụkwụ gị abụọ,* mee ka ịkwa iko gị na-amụbanye. 26Ị kwasoro ndị Ijipt bụ ndị agbataobi gị iko, ndị anụahụ ha dị ukwuu. I si otu a mee ka iwe dị ukwuu wee m megide ịkwa iko gị nke na-aba ụba. 27Nʼihi ya, esetipụrụ m aka megide gị, e webilatara m oke ala gị ka ọ dị ntakịrị; ewere m gị nyefee oke ọchịchọ nke ndị iro gị, bụ ndị inyom Filistia, ndị ihere mere nʼihi omume gị niile ruru unyi. 28Gị na ndị Asịrịa akwaala iko, nʼihi na afọ adịghị eju gị. Ọ bụladị mgbe nke a gasịrị, ị bụkwa onwe na-enweghị afọ ojuju. 29I mere ka ịkwa iko gị mụbaa ruo ala ndị Kaldịa, mba ahụ ịzụ ahịa doro anya. Ma ọbụladị na nke a afọ ejughịkwa gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.