Native Bible

Ezekiel 14:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha.

Ezekiel 14:20 in English

Ezekiel 14:20 · Berean Standard Bible

then as surely as I live, declares the Lord GOD, even if Noah, Daniel, and Job were in it, they could not deliver their own sons or daughters. Their righteousness could deliver only themselves.

Context

18dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta. 19“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile, 20dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. 21“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya. 22Ma a ga-enweta ụfọdụ ndị ga-afọdụ ndụ, bụ ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị a ga-anapụta site nʼahụhụ ndị a. Ha ga-abịakwute unu. Mgbe unu hụrụ omume ha, na obibi ndụ ha, ha ga-abụrụ unu ihe nkasiobi nʼihi na unu ga-esite na ha mata ụdị mbibi nke m mere ka ọ bịakwasị Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.