Izikiel 14:19
Ezekiel 14:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile,
Ezekiel 14:19 in English
Ezekiel 14:19 · Berean Standard Bible
Or if I send a plague into that land and pour out My wrath upon it through bloodshed, cutting off from it both man and beast,
Context
17“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya, 18dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta. 19“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile, 20dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwa na Noa, Daniel na Job bi nʼime ya, ha agaghị anapụta ụmụ ha ndị ikom maọbụ ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Ha ga-azọpụta naanị onwe ha nʼezi omume ha. 21“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.