Izikiel 14:17
Ezekiel 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya,
Ezekiel 14:17 in English
Ezekiel 14:17 · Berean Standard Bible
Or if I bring a sword against that land and say, ‘Let a sword pass through it,’ so that I cut off from it both man and beast,
Context
15“Asị na m eziga anụ ọhịa ọjọọ ka ha bịa bibie ala ahụ, mee ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu meekwa ka mmadụ ọbụla ghara ị site nʼime ya gafee nʼihi anụ ọhịa ndị ahụ, 16dịka m na-adị ndụ ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ọ bụrụkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼebe a, ha agaghị anapụta ọ bụladị ụmụ ha ndị nwoke maọbụ ụmụ ha ndị nwanyị site nʼịla nʼiyi. Naanị ha ka a ga-azọpụta, ma ala ahụ ga-abụ ihe tọgbọrọ nʼefu. 17“Ọ bụrụ na a sị na m mere ka mma agha bịakwasị ala ahụ, m sị, ‘Ka mma agha gabiga site nʼala ahụ niile gburugburu,’ ma gbuo mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya, 18dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, a sịkwarị na ndị ikom atọ ndị a nọ nʼala ahụ, ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom site nʼịla nʼiyi. Kama, ọ bụ naanị ha onwe ha ka a ga-anapụta. 19“Ọzọkwa, ọ bụrụ na m eziga oke iwe m site nʼajọ ọrịa na-efe efe, ọ bụrụ na ọrịa ahụ egbuo mmadụ na anụmanụ ha niile,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.