Izikiel 12:18
Ezekiel 12:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.
Ezekiel 12:18 in English
Ezekiel 12:18 · Berean Standard Bible
“Son of man, eat your bread with trembling, and drink your water with quivering and anxiety.
Context
16Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” 17Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere. 19Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya. 20Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.