Izikiel 12:20
Ezekiel 12:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ”
Ezekiel 12:20 in English
Ezekiel 12:20 · Berean Standard Bible
The inhabited cities will be laid waste, and the land will become desolate. Then you will know that I am the LORD.’”
Context
18“Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere. 19Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya. 20Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’ ” 21Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 22“Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.