Native Bible

Exodus 9:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị.

Exodus 9:32 in English

Exodus 9:32 · Berean Standard Bible

but the wheat and spelt were not destroyed, because they are late crops.)

Context

30Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.” 31Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru. 32Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị. 33Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ. 34Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.