Ọpụpụ 9:34
Exodus 9:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha.
Exodus 9:34 in English
Exodus 9:34 · Berean Standard Bible
When Pharaoh saw that the rain and hail and thunder had ceased, he sinned again and hardened his heart—he and his officials.
Context
32Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị. 33Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ. 34Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha. 35Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka Onyenwe anyị gwararịị Mosis.
9:11 Ihe otiti ọrịa, bụ ihe ịrịbama ndị mbụ, metụtara naanị ihe ndị ahụ niile nke ndị Ijipt na-efe dịka chi. Ma ihe otiti ọrịa nke ugbu a, metụtara ndị majiki Ijipt dịka ihe ịdọ aka na ntị, ka ha gharakwa ị bịaghachi nʼihi imaa Mosis aka nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.