Ọpụpụ 9:31
Exodus 9:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru.
Exodus 9:31 in English
Exodus 9:31 · Berean Standard Bible
(Now the flax and barley were destroyed, since the barley was ripe and the flax was in bloom;
Context
29Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị. 30Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ Onyenwe anyị Chineke egwu.” 31Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru. 32Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị. 33Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu Onyenwe anyị, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.