Ọpụpụ 9:16
Exodus 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile.
Exodus 9:16 in English
Exodus 9:16 · Berean Standard Bible
But I have raised you up * for this very purpose, that I might display My power to you,* and that My name might be proclaimed in all the earth.*
Context
14Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile. 15Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa. 16Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile. 17Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala. 18Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.