Native Bible

Exodus 9:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa.

Exodus 9:15 in English

Exodus 9:15 · Berean Standard Bible

For by this time I could have stretched out My hand and struck you and your people with a plague to wipe you off the earth.

Context

13Onyenwe anyị gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. 14Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile. 15Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa. 16Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile. 17Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.