Native Bible

Exodus 7:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl.

Exodus 7:24 in English

Exodus 7:24 · Berean Standard Bible

So all the Egyptians dug around the Nile for water to drink, because they could not drink the water from the river.

Context

22Ma ndị majiki Ijipt jikwa ihe nzuzo ha mee ka mmiri chaa ọbara ọbara.* Nke a mere ka Fero nyịchie obi ya. Ọ ṅaghị Mosis na Erọn ntị, dịka Onyenwe anyị gwara ha na ọ ga-eme. 23Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere. 24Ya mere, ndị Ijipt niile gwuru olulu mmiri nʼakụkụ osimiri ahụ ịchọ mmiri ọṅụṅụ ebe ha na-enweghị ike ịṅụ mmiri sitere nʼosimiri Naịl. 25Ụbọchị asaa gasịrị, site nʼụbọchị Onyenwe anyị tichara ihe otiti ahụ na Naịl. 7:1 Nke a pụtara, ga-abụ ọnụ na-ekwuru gị 7:15 Ndị Fero na-aga nʼosimiri Naịl ụtụtụ ụbọchị niile, nʼihi ikpe ekpere nye chi Naịl, onye ha weere ka nna chi niile. Ya mere, mmadụ ime ihe ọbụla ga-emetụta osimiri Naịl dịka onye ahụ ịmetụ aka na mkpụrụobi ndị Ijipt. Nʼihi na ha kwenyere na ihe ọbụla mee osimiri Naịl, nʼala Ijipt ga-aghọ ọzara. 7:22 Ihe ịrịbama (ọrịa na-efe efe) niile ndị a dị iche iche gosipụtara ike Chineke nʼebe ihe niile e kere eke dị, karịchasịa nʼebe ihe e kere eke nke ndị mmadụ na-efe dịka chi. Ọ bụ nʼetiti ọnwa mbụ nʼafọ ruo nʼọnwa anọ ka ihe ịrịbama niile ndị ahụ mere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.