Ọpụpụ 6:14
Exodus 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile. Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ, Hanok na Palu, Hezrọn na Kami. Ndị a bụ agbụrụ Ruben.
Exodus 6:14 in English
Exodus 6:14 · Berean Standard Bible
These were the heads of their fathers’ houses: The sons of Reuben, the firstborn of Israel, were Hanoch and Pallu, Hezron and Carmi. These were the clans of Reuben.
Context
12Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.” 13Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu banyere ụmụ Izrel na banyere Fero eze Ijipt. O nyere ha iwu sị ha site nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel. 14Ndị a bụ aha ndịisi ebo Izrel niile.
Ụmụ ndị ikom Ruben, ọkpara Izrel bụ,
Hanok na Palu, Hezrọn na Kami.
Ndị a bụ agbụrụ Ruben. 15Ụmụ ndị ikom Simiọn bụ,
Jemuel, Jamin, Ohad, Jakin, Zoha na Shaul (onye nne ya bụ onye Kenan).
Ndị a bụ agbụrụ Simiọn. 16*Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Livayị nʼusoro e si mụọ ha:
Geshọn, Kohat na Merari.
Livayị nʼonwe ya gbara narị afọ na iri afọ atọ na asaa mgbe ọ nwụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.