Ọpụpụ 5:22
Exodus 5:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m?
Exodus 5:22 in English
Exodus 5:22 · Berean Standard Bible
So Moses returned to the LORD and asked, “Lord, why have You brought trouble upon this people? Is this why You sent me?
Context
20Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha. 21Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.” 22Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m? 23Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.”
5:3 Nʼala Ijipt ehi na oke ehi bụ anụmanụ a na-ahụta ka ihe dị nsọ. Ya mere, ndị Izrel ji sị na ha ga-aga njem abalị atọ nʼime ọzara nọrọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị aja.
5:6 Ndị nlekọta ndị ohu na-arụ ọrụ bụ ndị Ijipt, ma ndịisi ndị ọrụ ahụ, bụ ndị Izrel.
5:7 Brik bụ ụrọ a gwakọtara ya na okporo ọka. Ọ bụ okporo ọka ahụ e tinyere ya na-enye aka ime ka o sie ike mgbe a na-amị ya nʼanwụ. Nʼoge owuwe ihe ubi, a na-egbupụ elu okporo ọka, ma hapụ ogwe ya. Ọ bụ ogwe ya ahụ, ka ụmụ Izrel na-egburu, gwakọta ya nʼụrọ jiri ya kpụọ brik.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.