Native Bible

Exodus 5:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.”

Exodus 5:21 in English

Exodus 5:21 · Berean Standard Bible

“May the LORD look upon you and judge you,” the foremen said, “for you have made us a stench before Pharaoh and his officials; you have placed in their hand a sword to kill us!”

Context

19Ndịisi ọrụ ụmụ Izrel ghọtara na ha nọ na nsogbu mgbe a gwara ha okwu sị ha, “Unu ga-akpụtarịrị ọnụọgụgụ brik unu kwesiri ịkpụ kwa ụbọchị.” 20Mgbe ha si nʼihu Fero pụọ, ha zutere Mosis na Erọn ebe ha nọ na-eche ha. 21Ndị nlekọta ọrụ ndị a gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Ka Onyenwe anyị lee unu anya ma kpee unu ikpe. Unu emeela ka anyị bụrụ ihe na-esi ajọ isi nʼihu Fero na ndị na-ejere ya ozi. Unu etinyela mma agha nʼaka ha nke ha ga-eji gbuo anyị.” 22Mgbe ahụ Mosis laghachikwuru Onyenwe anyị jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, gịnị mere i ji butere ndị a nsogbu? Gịnị mere i ji zite m? 23Nʼihi na site na mgbe m jekwuuru Fero gwa ya okwu nʼaha gị, o meela ka nsogbu dakwasị ndị a, ma ị napụtabeghị ndị gị.” 5:3 Nʼala Ijipt ehi na oke ehi bụ anụmanụ a na-ahụta ka ihe dị nsọ. Ya mere, ndị Izrel ji sị na ha ga-aga njem abalị atọ nʼime ọzara nọrọ nʼebe ahụ chụọrọ Onyenwe anyị aja. 5:6 Ndị nlekọta ndị ohu na-arụ ọrụ bụ ndị Ijipt, ma ndịisi ndị ọrụ ahụ, bụ ndị Izrel. 5:7 Brik bụ ụrọ a gwakọtara ya na okporo ọka. Ọ bụ okporo ọka ahụ e tinyere ya na-enye aka ime ka o sie ike mgbe a na-amị ya nʼanwụ. Nʼoge owuwe ihe ubi, a na-egbupụ elu okporo ọka, ma hapụ ogwe ya. Ọ bụ ogwe ya ahụ, ka ụmụ Izrel na-egburu, gwakọta ya nʼụrọ jiri ya kpụọ brik.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.