Native Bible

Exodus 40:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.

Exodus 40:34 in English

Exodus 40:34 · Berean Standard Bible

Then the cloud covered the Tent of Meeting, and the glory of the LORD filled the tabernacle.

Context

32Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu. 33Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ. 34Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya. 35Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ. 36Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.