Native Bible

Exodus 40:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

Exodus 40:32 in English

Exodus 40:32 · Berean Standard Bible

They washed whenever they entered the Tent of Meeting or approached the altar, just as the LORD had commanded Moses.

Context

30Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe. 31Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha. 32Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu. 33Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ. 34Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.