Native Bible

Exodus 4:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.”

Exodus 4:19 in English

Exodus 4:19 · Berean Standard Bible

Now the LORD had said to Moses in Midian, “Go back to Egypt, for all the men who sought to kill you are dead.”

Context

17Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.” 18Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.” 19Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.” 20Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya. 21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.