Native Bible

Exodus 4:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya.

Exodus 4:20 in English

Exodus 4:20 · Berean Standard Bible

So Moses took his wife and sons, put them on a donkey, and headed back to Egypt. And he took the staff of God in his hand.

Context

18Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.” 19Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.” 20Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya. 21Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa. 22Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Izrel bụ Ọkpara m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.