Native Bible

Exodus 39:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara.

Exodus 39:6 in English

Exodus 39:6 · Berean Standard Bible

They mounted the onyx stones in gold filigree settings, engraved like a seal with the names of the sons of Israel.

Context

4Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike. 5Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 6Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara. 7Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 8Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.