Ọpụpụ 39:5
Exodus 39:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Exodus 39:5 in English
Exodus 39:5 · Berean Standard Bible
And the skillfully woven waistband of the ephod was of one piece with the ephod, of the same workmanship—with gold, with blue, purple, and scarlet yarn, and with finely spun linen, just as the LORD had commanded Moses.
Context
3Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 4Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike. 5Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 6Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara. 7Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.