Ọpụpụ 39:3
Exodus 39:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
Exodus 39:3 in English
Exodus 39:3 · Berean Standard Bible
They hammered out thin sheets of gold and cut threads from them to interweave with the blue, purple, and scarlet yarn, and fine linen—the work of a skilled craftsman.
Context
1Ha sitekwara nʼogho akwa na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie (odo odo), nke na-acha uhie uhie, meere ndị nchụaja uwe akpara akpa nke ọma iyi jee ozi nʼebe nsọ ahụ. Ha meekwara Erọn uwe nsọ, nʼusoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis. 2Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ. 3Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 4Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike. 5Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.