Native Bible

Exodus 39:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị.

Exodus 39:14 in English

Exodus 39:14 · Berean Standard Bible

The twelve stones corresponded to the names of the sons of Israel. Each stone was engraved like a seal with the name of one of the twelve tribes.

Context

12Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti. 13Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa. 14Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị. 15Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi. 16Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.