Ọpụpụ 39:10
Exodus 39:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril,
Exodus 39:10 in English
Exodus 39:10 · Berean Standard Bible
And they mounted on it four rows of gemstones:* The first row had a ruby, a topaz, and an emerald;
Context
8Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya. 9Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ. 10Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril, 11nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ. 12Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.