Ọpụpụ 38:3
Exodus 38:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.
Exodus 38:3 in English
Exodus 38:3 · Berean Standard Bible
He made all the altar’s utensils of bronze—its pots, shovels, sprinkling bowls, meat forks, and firepans.
Context
1Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke ịla elu ya dị otu mita na iri sentimita atọ. Ogologo ya na obosara ya ha nʼotu. Ha dị mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ. 2Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a. 3Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ. 4Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya. 5Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.