Ọpụpụ 38:4
Exodus 38:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya.
Exodus 38:4 in English
Exodus 38:4 · Berean Standard Bible
He made a grate of bronze mesh for the altar under its ledge, halfway up from the bottom.
Context
2Ha rụnyekwara mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ ghọọ nke e jikọtara nʼotu. Ha jikwa bronz machie ebe ịchụ aja a. 3Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ. 4Ha mere ngịga mbadamba maka ebe ịchụ aja ahụ, ihe ọkpụkpa bronz, nke ga-adị nʼokpuru oghere ọnụ ọnụ ya. 5Ha kpụrụ mgbaka bronz ndị a ga-eji jide mkpara ndị ahụ maka akụkụ anọ nke ngịga bronz ahụ. 6Ha mere mkpara osisi akashia ndị a, were bronz machie ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.