Ọpụpụ 37:27
Exodus 37:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.
Exodus 37:27 in English
Exodus 37:27 · Berean Standard Bible
He made two gold rings below the molding on opposite sides to hold the poles used to carry it.
Context
25Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta. 26Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu. 27Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya. 28Ha ji osisi akashia mee mkpara ndị ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ha. 29Ha mekwara mmanụ otite dị nsọ, na ezigbo ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke a na-agwaghị ihe; bụ ọrụ nke onye na-eme mmanụ isi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.