Native Bible

Exodus 36:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.

Exodus 36:22 in English

Exodus 36:22 · Berean Standard Bible

Two tenons * were connected to each other for each frame. He made all the frames of the tabernacle in this way.

Context

20Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ. 21Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara, 22nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a. 23Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ, 24ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.