Native Bible

Exodus 36:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.

Exodus 36:20 in English

Exodus 36:20 · Berean Standard Bible

Next, he constructed upright frames of acacia wood for the tabernacle.

Context

18Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu. 19Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya. 20Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ. 21Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara, 22nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.